Proverbs 30

Okwu amamihe nke Agọ

1Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa,

Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal:

“Ike agwụla m, Chineke
ma a pụrụ imeri.
2Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla;
Abụ m anụ ọhịa, a bụghị mmadụ.

Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
3Amụtabeghị m amamihe,
maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
4Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa?
Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya?
Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya?
Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ?
Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya?
Gịnịkwa bụ aha nwa ya?


5“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,
Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
6Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya,
ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.

7“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ;
ajụkwala imere m ha:
8Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.
Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,
kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
9Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke,
ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’
Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi,
site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.

10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu,
ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.

11“Ọ dị ndị
Maọbụ, Ọgbọ
na-akọcha nna ha,
ha adịghị agọzikwa nne ha;
12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha
ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
13Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu,
ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
14Ndị eze ha niile bụ mma agha
ịkịrị eze ha bụkwa mma
maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa
na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.

15“Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ
ndị na-eti, ‘Nye, nye.’

“Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju.
E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
16Ala ili,
akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime,
ala nke mmiri na-adịghị eju afọ,
na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’

17“Onye ahụ na-akwa nna ya emo,
nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị,
ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya,
udele ga-erikwa anụ ahụ ya.

18“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha;
mbaa, ha dị anọ!
19Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe;
otu agwọ si akpụ nʼelu nkume,
otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri;
na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.

20“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko,
Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya,
na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’

21“Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji,
nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
22Ohu ghọrọ eze,
onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,
23nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị,
na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.

24“Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa,
ma ha maa ihe nke ukwuu.
25Ndanda bụ ndị na-enweghị ume,
ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
26Ewi nkume
Ewi nkume bụ otu ụdị oke nʼọtụtụ ụzọ oke e nwere. Ha na-ebi nʼigwe nʼugwu. Lev 11:5; Abụ 104:18
bụ ndị na-adịghị ike,
ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
27Igurube enweghị eze,
ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
28Ngwere dị mfe iji aka jide ya,
ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.

29“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube,
mbaa, ha dị anọ:
30Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
31na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị,
na mkpi,
na eze ndị agha ya gbara gburugburu.

32“Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu
maọbụ zube nzube ọjọọ,
anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere.
33A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi;
iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara,
otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
Copyright information for IboBIU